Aka na achi Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo, agọnarila ebubo na ọ gara na nke onye dibia anya nzu.
Written by Onyinye on June 6, 2025
Aka na achi Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo, agọnarila ebubo na ọ gara na nke onye dibia anya nzu gbasara nlaghachite n’ọkwa na ntule aka ọchịchị governorship election bu nke ga ewere ọnọdụ na abalị asatọ n’ọnwa November afọ a bu 2025.
Ụfọdụ ozi nakwa ihe onyonyo na efeghari n’ụwa ozi bu nke n’ebo ebubo na aka na chi State ahụ gara na nke onye dibia anya nzu, bu nke chọrọ iweda ohere ya n’ilaghachite n’ọkwa.
Kosila dị, ozi putara ihe site n’aka ode akwukwọ ya n’ihe gbasara ozi bu Christian Aburime n’ụbọchi Tuesday, mere ka amata na aka na chi State ahụ kọwara ebubo ahụ dika okwu asi.
Ọ gara n’iru kọwaa na ihe onyonyo ahụ na efeghari n’ụwa ozi dika ihe aka ebe na ọ gara na nke onye dibia anya nzu, bu nke esere n’oge yana ndi bi na State ahụ bu ndi na emeputa ihe onyonyo n’ụwa ozi yabu content creators nwere nzukọ.
Aburime kọwara na enyere ha ohere ka ha gosiputa ụdi nka ha nwere ma kwuputa ebum n’uche ha gbasara ngalaba mmepụta ihe na State ahụ.
N’okwu ya, ọ gara n’iru kọwaa na dika ha na egosipụta ụdị nka dị iche iche ha nwere, na otu onye gosiputara nke ya na ụdị nwa dibia anya nzu bu ebe ihe onyonyo ahụ na efeghari n’ụwa siri puta.
Aka na chi State ahụ kpọkpuru ụmụ afọ State ahụ, ndị nwere ụlọ mgbasa ozi nakwa ndị nke nọ na ụwa ozi ka ha wepu uche na ihe onyonyo ahụ na efeghari n’ụwa ozi bu nke na edughie ụzọ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.