Nkusu nke mba Israel na-eme na mba Iran abụrụla nke na akawanye njọ kwa ụbọchị.
Written by Onyinye on June 16, 2025
Mba Israel amalitela ikusu ogige ebe mba Iran na-arụ ngwa agha ọ gwụrụ mba yana ndị ọrụ nke ya bụ ogige tinyere ogige ndị agha nke mba ahụ.
Ugbua, ozi mere ka amata na ha agbakwunyela ogige ebe obibi nke ndị mmadụ, ọdụ mmanụ ụgbọala, ụlọrụ ministries tinyere ụgbọelu nke ha gbarigoro bụ nke na agbanye mmanụ na ọdụ ụgbọelu Mashhad Airport nke ha nọrọ ihe ruru ntụ kilometres puku abụọ were mee.
Ihe ndị emebigoro na mba Iran abụrụla nke malitere ịtụ ndị mmadụ ụjọ.
Ndị agha mba Israel ekwuola na ha na-achọ ụzọ ha ga-esi na abanye n’obodo Tehran bụ isi ọchịchị mba Iran ebe onye ji ọkwa defence minista na mba Israel bụ Israel Katz yiri oke egwu sị na ha pụrụ iji ọkụ were gbarie Tehran ma ọ bụru na mba Iran aga n’ihu na-atụ ogbunigwe akpọrọ missile na mba Israel.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.