Onu ego ana eregasi akurungwa na mba UK ariala elu orji
Written by Onyinye on June 18, 2025
Onu ego ana ere akurungwa na mba UK nke afo a agbagola na percent ato na Uma ano n’ime onwa May gara aga.
Yabu inflation,nke n’ egosi etu onu ego ana eregasi ihe si aga noro n’ onwa gara ria elu orji dika akurungwa nri ihe eji ebigasi n’ ulo nakwa onodu obibi ndu n’ ari kwa ubochi.
Nwa amadi ahu ji okwa chancellor bu Rachel Reeves mere ka amata na aka nwere otutu ihe aga eme banyere nkea ebe chancellor Mel stride kowara na oke ngala onu akurungwa ndi a n’ atopuzi ezi n’ ulo di iche iche ogodo n’ ukwu.
N’ onwa April ka eweputara nguputa na onu ego ana ere akurungwa no na percent ato na Uma ano kama na ulo olu ONS mechara kowaputa n’ enwere ihe nkpobi ukwu na yabu nguputa, na okwesighi iru one ahu.
K’ osiladi, ulo oba ego mba England noburi na mbu me ka amata,na ha n’ atu anya na onu ego ana eregasi akurungwa ka ga agbagokwu na percent ato na Uma asaa n’ agbata onwa July ruo September tupu inaghachite azu na percent abuo aturu anya ya.