Aka Na Achi Enugu State Enyela Nkwado Mbugo Na Okwa Puku Kwuru Puku Ndi Olu Oyibo State A
Written by admin on April 2, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah enyela nkwado ibugo ha na okwa bu ndi olu oyibo State a di puku abuo, otu nari na iri na ano.
Nke a putara ihe na ubochi Tuesday na isi obodo Enugu dika anuli juputara na onu habu puku kwuru puku ndi olu oyibo ihe oma a kporo iru.
Ndi a ebugoro na okwa ka ozi mere ka amata na ha sonyere na nnwale 2025 Promotion and Conversion Exercises were onodu na State a na agbata onwa November nakwa December yabu afo gara aga.
Na okwu ya oge ona ekwuputa ihe oma a ka onye isi oche ulo olu Enugu State Civil Service Commission bu Mazi Robinson Odoh kowara nke a dika ukwa dara na oge ya ma buru nkwalite ume olu gaara habu ndi olu oyibo.
Mazi Odoh kowara na nke a metutara ndi olu oyibo na ogogo Grade Level nke mbu ruo na nke iri na asaa bukwanu ndi sonyere ma nafere na nnwale emere ha.
Yabu onye isi oche ulo olu State a na ahu maka odimma ndi olu oyibo kowara na mbugo na okwa a amalitego idi ire ozugbo ma gunyere ego nrite sona ya.
Na nke ka onye isi habu ndi olu oyibo State a na okwa Head of Service bu Dr Godwin Anigbo kowara ezi ukporo aka na achi State a jigasi na aka dika nke nyere gburugburu doro aru gaara ndi olu.
Dr Anigbo toziri Gov Peter Mbah maka inye nkwado ibugo habu ndi olu oyibo na okwa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.