Ego Ala Anyi Bu Naira Agala Na Iru Mee Nke Oma Megide Ego Dollar Mba America
Written by admin on April 16, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ego ala anyi bu Naira anorola na ebe mgbanwerita ego mba ofesi amara dika Foreign Exchange Market ForEx kutetu ume ndu megide ego Dollar mba United States of America akporo US Dollar.
Nke a bu dika Naira noro unya bu Wednesday gbanwe na onu ego di otu puku, nari Naira ato, iri iteolu na ato yabu; 1 Thousand, 3 Hundred and 93 Naira maka otu Dollar na ogogo parallel market.
Yabu mgbanwe unya ka ahutara dika ime nke oma ma elegara anya na anoro nwanne unya bu Tuesday gbanwe otu Dollar na onu ego di otu puku, nari Naira ano na ato nke putara 1 Thousand, 4 Hundred and 3 Naira na yabu ogogo parallel market.
Na ogogo nke Nigerian Foreign Exchange Market NFEM ka Naira noro unya gbanwe na onu ego di otu puku, nari Naira ato, iri ano na otu na uma iri iteolu na iteolu yabu; 1 Thousand, 3 Hundred 41 point 99 Naira maka otu Dollar.
Nke a gosikwara nkutetu ume ndu nke ya ma elegara anya na onu ego di otu puku, nari ato, iri ano na asato maka otu Dollar agbanwere ego ala anyi a nwanne unya na ogogo NFEM.
Ka emechara habu azum ahia mgbanwerita ego mba ofesi unya ka ahutara na Naira ji mgbakota onu ego di Naira iri mee nke oma na ogogo parallel market, ebe oji Naira isii na otu uma mee nke oma na ogogo nke NFEM.
Ka osiladi, ihe nguko sitere na aka ulo oba ego etiti Central Bank of Nigeria CBN na ututu taata bu Thursday na egosi na ndiche dina ebe mgbanwerita ego parallel market nakwa NFEM ka emechara na abali unya buzi Naira iri ise na otu na otu uma yabu; 51 point 1 Naira site na Naira iri ise na ise onobu nwanne unya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.