Otu Ndorondoro APC Na Ebonyi State Adanyela Na Ajo Onodu Mgbaghapu
Written by admin on May 8, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ufodu ndi aka ji aku ji ego achu nta ego ma buru ndi welitere isi nke oma na otu ndorondoro All Progressives Congress APC na Ebonyi State agala na iru na igba alukwaghim na yabu otu ndorondoro dika osiri metuta nkwadebe maka ntule aka ochichi izugbe afo 2027.
Nke a bu dika onye ama ama ji ego achu nta ego ma buru onye omepuru ndi nona mkpa sitere Ikwo LGA na State ahu bu Dr Christian Asaga Nwali amakariri dika C-Sagas gbaghapuru yabu otu ndorondoro.
Na akwukwo ozi alukwaghim odegara onye isi oche otu ndorondoro APC na onumara Ward ya akporo Ekpelu Ward dina Ikwo LGA ka C-Sagas mere ka amata na obu mkpebi onwe ka ojiri chulie aka ma gbaghapu ihe obuna jikoro yana otu ndorondoro APC.
Nwa amadi a ka ozi kowara na onoro na odi nso a gosi mmasi ya iji okoloto APC zoo okwa Senator maka ogbonta vote Ebonyi Central Senatorial District nke ulo nzuko ukwu Senate na afo 2027 mana aka na achi State ahu bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru nwere nkwekorita na udi akporo consensus yana ndi ozo sina obu onye nona yabu oche ulo nzuko ukwu ka odi ugbu a bu Sen Kenneth Eze ka ga eji okoloto APC zogharia okwa na afo ozo.
Ozi mekwara ka amata na onye ozo ana ahuta dika onye aka ji aku kachasi nwe ego na Ebonyi State ma buru onye sitere Ezza South LGA nke State ahu bu Chief Chibuike Orogwu amakariri dika BabyOku noro na aka nke ya na izu ụka a mee ka oputa ihe na ozuzu oke bu alukwaghim ya na otu ndorondoro APC.
Na ozi odegara onye isi oche yabu otu ndorondoro na onumara Ward ya dina Ezza South LGA ka BabyOku kowara na onojugo ma tokwa APC maka ohere onyere ya oge osona yabu otu ndorondoro.
Na otu aka ahu ka onye ozo ama ama ji ego achu nta ego sitere Ohaukwu LGA bu Chief Tochukwu Ogalegu amakariri dika T-Man nokwuru na izu ụka a gbaghapu otu ndorondoro APC ma banye na nke All Progressives Grand Alliance APGA iji nweta ohere zoo okwa na ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives maka ogbonta vote Ebonyi/Ohaukwu Federal Constituency na afo 2027 kwere maka ojuju APC juru inye ya ohere iji okoloto ya zoo yabu okwa.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na obu kemgbe ubochi Tuesday nakwa Friday izu ụka gara aga Gov Francis Nwifuru nakwa ndi ozo onu na eru na okwu na otu ndorondoro APC na State ahu nwechara nkwekorita na udi a akporo consensus ndi ga eji okoloto yabu otu ndorondoro zoo okwa na afo 2027 ka igba alukwaghim a malitere ida aghara aghara na APC.
Ozi kowakwara na yabu nkwekorita adabaghi nke oma gaara onye ahu jitopuru okwa Governor State ahu ma noro ugbu a na okwa minister ala anyi na ahu maka olu bu Sen David Umahi kwere maka ozi nzaghachi odeputara megide ya ma buru nke kepu kepu kowara na obu nghotahe nyere yana aka na achi State ahu, mana Gov Nwifuru mechara noro na ubochi uka gara aga kowa na yana Sen Umahi ka nokwa na udo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.