Ochichi Etiti Nigeria Akasiala Mba Botswana Obi Na Okwu Onye Jiburu Okwa Onye Isi Ala Mba Ahu

Written by on May 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt etiti ala anyi dina aka ochichi President Bola Ahmed Tinubu esitela na onu Minister na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu zigara ochichi nakwa umu afo mba Botswana ozi nkasi obi maka onwu onye jiburu okwa onye isi ala mba ahu bu Late President Festus Gontebanye Mogae bukwanu onye nwuru ka ogbachara afo iri asato na isii na elu uwa.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi na uhuruchi unya bu Friday bu nnukwute onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh nke obu onu na ekwuru ulo olu Ministry ahu bu Kimiebi Imomotimi Ebienfa binyere aka ka Amb Odumegwu-Ojukwu noro kowa onwu Late President Mogae dika ihe mwute ma kowa nwoke a dika ezi onye ochichi nyere mba Botswana nakwa ala isi oji Africa oge onoro na ochichi na agbata afo 1998 ruo 2008.

Yabu Minister kowara na ochichi etiti ala anyi sonyere umu afo mba Botswana na iru uju nwa amadi a omere ka amata na ochichi ya sona ndi kachasigo gbasoro ezi usoro ochichi onye kwuo uche ya na Africa.

Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu ruturu aka na mbo yabu onye isi ala nwuru anwu gbara ibu agha megide nje HIV nakwa AIDS oge okachasi wakposie mba Botswana ike, gunyekwara mbo ya nyere ikwalite udo nakwa nkwudosi ike nke ala isi oji Africa.

Na ikpeazu ka nwaanyi a mere ka amata nkwudosi ike nke ezi udo mmekorita dina etiti ala anyi nakwa mba Botswana.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited