Amb Odumegwu-Ojukwu Amalitela Olu Ya Na Ozuzu Oke Na Mbugo Na Okwa Ohuru President Tinubu Bugoro Ya
Written by admin on May 10, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu amalitela olu ya na ozuzu oke na mbugo ahu President Bola Ahmed Tinubu noro na odi nso a bugo ya site na okwa Minister ogo nta na ahu maka odimma mba ofesi gbago na okwa Minister odimma mba ofesi na ozuzu oke ya.
Nke a putara ihe na ubochi Friday na ogbako nnabata yabu Minister jiri malite olu ya na ozuzu oke nke onye noro na isi nhazi ya bu onye Permanent Secretary ulo olu Ministry ahu bu Amb Dr Dunoma Umaru Ahmed nakwa ndi Directors-General ulo olu sitegasiri na yabu Ministry odimma mba ofesi gunyere ndi Directors welitere isi na ulo olu ahu.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi unya bu Saturday bu nnukwute onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh nke onye binyere aka na ya bu onu na ekwuru ulo olu Ministry ahu bu Kimiebi Imomotimi Ebienfa ka Amb Dr Ahmed buru ukpo ekene gaara Amb Odumegwu-Ojukwu maka mbugo na okwa a okowara dika nke dabara na ezi mbo ona agba.
Na oge ona ekwuputa ntukwasa obi sina Amb Odumegwu-Ojukwu ga emezu ihe aturu anya na aka ya dika Minister odimma mba ofesi nyere ala anyi ka yabu onye Permanent Secretary mere ka amata umuala na nrube isi nyere ochichi ya.
Na nke ya ka Minister a bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuputara obi anuli ya nyere nnabata a anabatara ya ma kwe nkwa mkpebi ya nyere ezi ebum na uche ochichi President Tinubu na ebe yabu ulo olu Ministry noo.
Amb Odumegwu-Ojukwu gara na iru kowa idi uchu ya na itinye na olu nke oma bu atumatu ano amara dika 4D Foreign Policy Agenda gbadoro ukwu na ochichi onye kwuo uche ya, mmepe, umu afo ala anyi nona mba ofesi nakwa ezi udo mmekorita ala anyi nyere mba uwa ndi ozo.
Ogara na iru too ezi idi uchu na olu ndi olu ulo olu Ministry ahu ma kwe ha nkwa mkpebi nyere ikwalite odimma ha.
Anoziri na ogbako a huta ozi itu mma mma sitere na onu ndi nochitere anya ulo olu ndi ahu nwere njiko nyere yabu Ministry bukwanu ulo olu ndi gunyere: Directorate of Technical Cooperation in Africa, nke Nigerian Institute of International Affairs, ulo olu Institute for Peace and Conflict Resolution nakwa onye Permanent Representative ala anyi nyere otu ECOWAS bu Amb Olawale Emmanuel Awe bukwanu ndi kwechara nkwa nkwado nyere Amb Odumegwu-Ojukwu na okwa ya dika Minister.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.