Otu Ndorondoro NDC Ewetala Ya Na Isi Njedebe Bu Ohere Ikikere Ndi Choro Iji Okoloto Ya Zoo Okwa Onye Isi Ala
Written by admin on May 18, 2026
by Maduabuchi Onwe
Otu ndoro ndoro ochichi Nigeria Democratic Congress NDC emela ka amata na omechigo ohere nke inye ndi nwere mmasi iji yabu okoloto otu ndoro ndoro ochichi wee puta maka okwa onye isi ala Nigeria na afo 2027.
Ogakwara na iru kwuputa na agbatigo oge maka ndi choro iji yabu otu ndoro ndoro ochichi wee zoo okwa, governor, Senate, House of Rep, nakwa House of Assembly bido na abali iri na asaa nke onwa May kwusi na abali iri abuo na ano nke onwa May afo a bu 2026.
Nke a putara ihe site na ozi onye ode akwukwo izugbe nyere yabu otu ndoro ndoro ochichi NDC na Nigeria bu maazi Ikenna Enekweizu nyefere ndi nta akuko na odi nso a.
Na ikpazu ka omere ka amata na ha ga ebido nnyocha gara ndi gotere akwukwo iji yabu otu ndoro ndoro ochichi puta maka okwa onye isi ala na afo 2027 bido na ubochi Tuesday abali iri na iteolu nke onwa May afo 2026.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.