Ochichi Nigeria Nakwa Mba Italy Enwela Nkwekorita Ikwalite Mmuta Site Na Usoro GPE
Written by admin on May 22, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ala anyi bu Nigeria nakwa mba Italy enwela mkpebi iweputa otu olu akporo Working Group maka ntinye na olu atumatu Global Partnership for Education GPE dika osiri metuta ichuta ego di ijeri Dollar ise yabu; 5 Billion US Dollars maka amuma a ebum na uche ya bu igbanwe ezi onodu mmuta nari nde kwuru nde umuaka na uwa niile.
Ala anyi kwekwara nkwa isonyere nke oma na ogbako mmuta Global Education Summit ga ewere onodu na onwa September afo a bu 2026 na Rome nke yabu mba Italy maka nkwalite ezi atumatu a.
Ihe ndi a putara ihe site na onu Minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu oge onabatara onye nnochite anya mba Italy na ala anyi bu Amb Roberto Mengoni na njem mkpoturu omegara ya.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi unya bu Thursday bu onye ndumodu puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara nzikorita ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh nke onye binyere aka na ya bu onu na ekwuru ulo olu Ministry ahu bu Kimiebi Imomotimi Ebienfa ka Amb Odumegwu-Ojukwu gwara yabu onye nnochite anya mba Italy na President Bola Ahmed Tinubu ji ihe banyere mmuta kporo mkpa nke ukwuu na atumatu ochichi ya okporo Renewed Hope Agenda.
Yabu Minister kowara na njiko aka na olu a ga enye aka kwalite aka olu, iwe na olu nakwa ezi onodu mgbochi mmighari njem opupu mba ofesi nyere umunetoeto na ala anyi.
Na oge ona ekwuputa ezi usoro mkpaarita ububo banyere ogbugbo ihe ndi metutara mmighari njem mba ofesi ka Amb Odumegwu-Ojukwu kwere nkwa sina ala anyi nakwa mba Italy ga aga na iru na ezi udo mmekorita.
Na mbu na okwu ya ka yabu onye nnochite anya mba Italy bu Amb Roberto Mengoni kowara mkpoturu a dika nke biara na ezi mkpa ma elegara anya na ala nakwa Italy bu mba abuo nona isi oche nke yabu atumatu Global Partnership for Education.
Kimiebi Imomotimi Ebienfa noziri na ozi a obinyere aka kowa na ewezuga ihe banyere nkwalite mmuta, na anokwuru na nzuko a lebara anya maka ezi onodu mmekorita ala anyi nakwa mba Italy na ebe ndi ozo gunyere: njem nleru anya, akuluba nakwa nchekwa.
Ozi gara na iru mee ka amata na ana atu anya achum nta ego mgbakwunyere di ijeri Dollar iri na afo 2030 nke usoro Domestic Education Financing maka yabu atumatu Global Partnership for Education.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.