Otu CAN Ariola Ochichi Etiti Nigeria Ka Okwuputa Gbatagbata Megide Ajo Onodu Nchekwa Ala Anyi
Written by admin on June 3, 2026
by Maduabuchi Onwe
Otu jikotara ndi okpukperechi uka christ na Nigeria amara dika Christian Association of Nigeria CAN ariola government ogogo etiti ala anyi ka okwuputa onodu gbata gbata gara enweghi ezi nchekwa bukwanu nke na atopu ndi mmadu ogodo na ukwu na ala anyi a bu Nigeria.
Nke a putara ihe site na ozi onye isi otu CAN na Nigeria bu Archbishop Daniel Okoh nyefere ndi nta akuko na ogbako National church denominational leaders summit nke afo a were onodu unya bu Tuesday na Abuja bu isi obodo Nigeria.
Yabu ogbako summit nke isiokwu ya bu: nsogbu ala anyi bu Nigeria noo na ime ya, nakwa uzo kacha mma aga esi wee gboo yabu nsogbu, ka yabu otu CAN noro wee tule ihe ndi ahu na adoghachi aka elekere azu na ebe ometutere mmepe nakwa nkwalite akunuba ala anyi bu Nigeria.
Ma kwuputa na enweghi ezi nchekwa bu isi sekpu nti nke ndalazu akunuba nakwa mmepe ala anyi a bu Nigeria.
Wee kpokuziri government ogogo etiti ala anyi na ikpazu ka ha biko dodo kwuputa onodu gbata gbata nyere enweghi ezi nchekwa bukwanu nke juputara ebe nille na Nigeria.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.