Aka Ndi Uwe Ojii Akpatala Nwoke Mara Otu Obere Nwata Nwaanyi Elu Na Ike Na Abia State
Written by admin on June 7, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ndi uwe oji ala anyi na Abia state anwuchiela otu nwoke kwere maka ebubo ikwaso otu obere nwata nwaanyi gbara naani afo iteolu iko na ike na ime obodo Ebem nke dina Ohafia local government area nke state ahu.
Nke a biara dika umu nwaanyi obodo ahu nochara na odi nso a wee mee ngaghari iwe nke amara dika lkpa mbogo wee megide yabu agwa ekperima ikwaso nwaanyi iko na ike na state ahu.
Na nke ha ka ndi uwe oji ala anyi na state ahu mere ka amata na ha anwuchigo nwamadi ahu ma hafenyezie ya na aka ulo olu na ahu maka ime nyocha gbasara agwa ekperima bu State criminal investigation department SCID maka ime ya nnyocha nke oma choputa nke bu eziokwu na yabu ebubo.
Na ikpazu ka ha yoziri oha obodo Ebem ka ha noro juu, dika ha kwere nkwa na nke bu eziokwu ga aputa ihe oge na adighi anya, ma gbakwunye na ana emezi yabu obere nwa akwasoro iko na ike nnyocha na ulo ogwu ka odi ugbu a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.