America akagbuola ihe niile bu ohere ikikere mba ofesi ya gaara umu afo mba South Sudan.

Written by on April 7, 2025

Mba United States of America ekwuputala nkagbu gaara ohere ikikere njem mba ofesi nke amara dika visa megide umu afo mba South Sudan kwere maka ihe yabu mba nwa onye ocha kowara dika akparama agwa ojo yabu mba dina ala isi oji Africa.

Nke a putara ihe site na onu ode akwukwo govt mba America na okwa US Secretary of State bu mazi Marco Rubio na ozi oweputara na obi govt mba America bu White House nke Washington DC bu isi obodo mba ahu.

Mazi Rubio gwara ndi nta akuko na nkagbu ka ha raa bu ohere njem mba ofesi habu umu afo mba South Sudan bu kwere maka ojuju yabu South Sudan juru inabata umu afo mba ahu enyere oso na mba America.

Yabu ode akwukwo ochichi mba America kwuputara na agana anozi na ogige US Ports of Entry enwegasiri na mba ahu egbochi umu afo mba South Sudan choro ibata mba America.

Otaziri uta gaara ochichi nchere oge mba South Sudan ihe kpatara oga ajuu inabata umu afo ya agbara ugbonwamkpi site na mba America ma obukwanu mba ofesi ndi ozo.

Ndi nta akuko nwetara ozi na habu umu afo mba South Sudan sona otutu ndi ahu ochichi President Donald Trump nyere oso na mba America kwere maka na ha nona mba ahu na uzo megidere iwu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited