Enyela nkowa etu ndi agha mba Russia siri kwafusie obara otutu ndi mmadu ozo na mba Ukraine.
Written by Onyinye on April 7, 2025
Achoputala ozu otutu umuaka sona ndi ahu ndi agha mba Russia napuru ndu ha na ike na nkwasu igbudu ndi agha ha megara ohuru na mba Ukraine na abali onemone gara aga.
Ozi mere ka amata na obu na imime obodo onye isi ala mba Ukraine amara dika Kryvyi Rih nke mpaghara Central Ukrainian City ka habu ndi agha mba Russia mere nkusu ohuru a.
Na yabu nkusu ha ji ngwa ogu missile mee ka anoro dula opekata mpe mmadu iri na asato mmuo na ike, ebe otutu ndi ozo nwetara ihe mmeru aru di ichiche.
Ka osiladi, na okwu ya ka onye isi ala mba Ukraine bu President Volodymyr Zelensky mere ka amata na mmadu iteolu na ime ndi ahu ndi agha mba Russia dulara mmuo na ike bucha obere umuaka.
Na nkusu ohuru a were onodu na ubochi Friday gara aga ka President Zelensky kowara na ndi agha mba Russia noro na ya bibie otutu ulo nakwa akuluba ndi ozo, ebe otara uta gaara ogbo ya na achi yabu mba Russia bu President Vladimir Putin maka yabu nkwasu igbudu ndi agha.
Iga echetazi na obu kemgbe onwa February afo 2022 ka President Putin nke mba Russia duru ndi agha ya malite mwakpo na mba Ukraine ma buru mwakpo butere ogbaghara tagoro isi nde kwuru nde ndi mmadu ma bibie ijeri kwuru ijeri akuluba.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.