Ndi uwe oji ala anyi na Anambra state anwuchiela mmadu ano ana enyo enyo maka agwa ekperima na state ahu.
Written by Onyinye on April 12, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Anambra state anwuchiela mmadu ano ana enyo enyo maka ntoli nakwa ori nke usoro owa ozi tinyekwara otutu agwa ekperima ndi ozo n’ okpuru ochichi Ihiala LGA nke state ahu.
N’ ozi onyefere ndi nta akuko tata bu Friday ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu SP Tochukwu Ikenga noro me ka amata na anwuchiri ndi a ana enyo enyo unya bu Thursday site na nnyocha ndi nchekwa gbakoro aka me na ihiala.
SP Ikenga kowara na habu ndi nchekwa gara olu a site n’ ozi ha kwere goro otutu oge banyere ndi ekperima ana amaghi iru ha bu ndi nke n’ eyi ndi mmadu egwu ntoli, ogbaghara tinyekwara isite n’ usoro owa ozi ezu ndi mmadu ori na state ahu, okachasi na mpaghara ihiala.
SP Ikenga nyere aha umu nwoke ano a aka kpatara dika chimezie Ezebuo, Chinaza Ndimani, Chinecherem Okafor, nakwa Nzube Azubuike bucha umu afo okohia ihiala.ma n’ akowakwa naha ejirigo onu ha kweta na aka ha di n’ agwa ekperima ahu.
Yabu onye PPRO na Anambra state gakwara n’ iru me ka amata na ndi uwe oji ka dikwa uchu inye ohaneze nchekwa ma n’ agbakwa mbo ihu na ha nwuchiri ma ta ha ahuhu ,bu onye ma obu ndi obula ga ebute onodu iyi egwu gara ndi mmadu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.