Ndi uwe oji mba Turkey anwuchiela otu onye mayor mba Istanbul

Written by on March 19, 2025

Ndi uwe oji mba turkey anwuchiela otu onye mayor mba Istanbul kwere maka nnyocha agwa nruru aka ana ebo ebubo n’otinyere aka.

Nwoke a enyere aha ya dika Ekrem imamoglu ma buru onye n’amasa President Recep Tayyip Erdogan aka n’ iru ka ndi uwe oji anwuchiri n’ ututu tata bu Wednesday tinyekwara mmadu di otu nari ndi ozo ha kana acho.

Nwa amadi a ka ana ebo obubo na oweputara ihe onyonyo n’ ebo ochichi mba ahu ebubo imegide echiche ndi mmadu.

Ochichi mba turkey gakwara n’ iru mechie otutu okporo uzo di na gburu gburu mpaghara Istanbul ma machie ihe obula bu ngaghari iwe n’ udi obula megide mnwuchi anwuchiri imamoglu .

I ga echeta na akpolitere imamoglu dika mayor nke mpaghara kachasi buo ibu na mba turkey n’ onwa March afo 2019 site n’ otu ndorondoro akporo AK party bu ebe onoro chia ihe ruru ogu afo na abuo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited