Onyeisi ala Nigeria bụ President Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala ọnọdụ gbata gbata nwa bekee kpọrọ state of emergency nyere ọchịchị Rivers State.

Written by on March 19, 2025

Onyeisi ala Nigeria bụ President Bola Ahmed Tinubu anọrọla n’abalị taa bụ Tuesday were kwupụta ọnọdụ gbata gbata nwa bekee kpọrọ state of emergency nyere ọchịchị Rivers State.

President Tinubu kwuru nkea n’okwu ọ gwara ụmụ afọ ala anyị na izugbe ya.

Onyeisi ala kwuru na etu ihe si aga ka ọ dị ugbu a na Rivers State abụrụla nke na echu ya ụra ma taa Gov Siminalayi Fubara na-achị state ahụ ụta maka ịkwatusi ụlọ omebe iwu nke state ahụ.

O kwuru na ọ bụ ka ya tulechara etu ihe si aga kpatara ya na enweghị ohere ọzọ kama ị kwupụta ọnọdụ gbata gbata nyere ọchịchị nke state ahụ.

Ihe ndị ọzọ onyeisi ala mere gụnyere ịkwụsị Gov Siminalayi Fubara ọrụ ya dịka aka na-achị state yana osote ya bụ Ngọzi Ọdụ ọrụ ha ihe ruru ọnwa isii ka ọ dị ugbu a.

President Bola Ahmed Tinubu gara n’ihu jiri ikikere o nwere dịka onyeisi ala were kwụsị ndị niile a họpụtara site na ntụliaka dịka ndị omebe iwu nke Rivers State House of Assembly ma mecha kpọlite Vice Admiral Ibokette Ibas jegoro ezumike nká n’ọrụ agha mmiri ala anyị dịka onye ga ejidegodu Sole administrator gana ahụ maka ọchịchị Rivers State.

Onyeisi ala gara n’ihu mee ka amata na ọnọdụ gbata gbata ahụ emetụtaghi ngalaba ikpe nke Rivers State judiciary.

Ya bụ onye Sole administrator ọhụrụ ka e kwuru na ọ gaghị emepụta iwu ọhụrụ nyere Rivers State ebe ọrụ ya niile bụ nke ga enweta nkwado site n’aka otu federal executive Council nke onyeisi Nigeria nọ n’isi ya.

Mkpebi ndị a niile na-abịa ozugbo onyeisi ala zutechara ndị isi ọrụ nchekwa ya akpọrọ service chiefs yana onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị.

N’oge ọgbakọ ahụ malitere mgbe ọ kụrụ elekere atọ nke ehihie ka ahutakwara onye ji ọkwa Senate president n’ala anyị bụ Godswill Akpabio yana ogbo ya Senate leader bụ Sen Opeyemi Bamidele.

Ogbo nke ọnụ na e kwuru ụlọ nnọchiteanya house of representatives bụ Rt Hon Tajudeen Abbas yana osote ya bụ Benjamin Kalu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited