President Donald Trump na-achị mba United States anọrọla ụnyaahụ bụ Thursday were kwuo sị na ọ ga-amasị ya ka mba Russia lọghachi azụ n’otu group of seven nations bu otu mejupụtara mba ndị ahụ akụnụba ha bụ akwaa akwụru na mba ụwa niile.

Written by on February 14, 2025

President Donald Trump na-achị mba United States anọrọla ụnyaahụ bụ Thursday were kwuo sị na ọ ga-amasị ya ka mba Russia lọghachi azụ n’otu group of seven nations bu otu mejupụtara mba ndị ahụ akụnụba ha bụ akwaa akwụru na mba ụwa niile. O kwuru na ọchụchu a chụpụrụ obodo Moscow n’otu ahụ adabaghi adaba.

Mba Russia bụbu otu n’ime mba ndị ahụ n’oge amara ya dịka G8 mana e mechara gbaa ha ụgbọ nwamkpi ozugbo ha malitere busowa mba Ukraine agha.

President Trump kwuru nkea n’ogige white house nke mba US mana enwebeghi nzaghachi ọbụla sitere na mba Canada bụ ndị ọ bụ ha bụ isioche otu G7 nke afọ a nyere atụmatụ ahụ Donald Trump wepụtara.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited