Ulo nzuko omebe iwu Anambra State ekwuputala ntukwasa obi gaara ochichi aka na achi State ahu.

Written by on March 19, 2025

Ulo nzuko omebe iwu Anambra State House of Assembly ekwuputala ezi onodu ntukwasa obi gaara aka na achi State ahu bu Gov Charles Chukwuma Solodu maka ihe ha kowara dika ezi ochichi ochigoro na ime afo ato omalitere olu.

Nke a putara ihe na Awka bu isi obodo Anambra State site na okwu onu na ekwuru yabu ulo nzuko bu Rt Hon Somtochukwu Udeze gwara ndi nta akuko banyere mbo ochichi di ugbu a na State ahu gbagoro na ime afo ato gara aga.

Rt Hon Udeze kowara na ikwuputa yabu ezi onodu ntukwasa obi gaara Gov Soludo bu dika osiri di na ozi otu Committee niile nke ulo nzuko ahu bucha ozi kowara ezi olu aka na achi State ahu rugoro na ime afo ato onogoro na ochichi.

Nwa amadi a gwara ndi nta akuko na ebe ndi ahu aka na achi Anambra State kachago ruo olu oma gunyere: iruputa ihe ndi ahu eji akwalite obibi ndu, nchekwa, mwulite akuluba ndi mmadu, mmuta, nkwalite ndi ntorobia, olu ugbo, igbanwe ogige yabu ulo nzuko omebe iwu na ogogo ka mma nakwa otutu olu oma ndi ozo.

Iga echetazi na obu na abali iri na asaa nke onwa March afo 2022 ka eduru Gov Charles Chukwuma Soludo na iyi olu maka ochichi nke izizi ya dika aka na achi Anambra State, kpatara na obu unya bu Monday, abali iri na asaa nke onwa March afo a bu 2025 ka ochichi ya gbara afo ato na State ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited