Utu isi ohuru ahu President Donald Trump manyere otutu mba amalitela idi ire.
Written by Onyinye on April 9, 2025
Utu isi ngwa ahia ohuru ahu aka n’ achi mba America bu President Donald Trump manyere otutu mba n’ ebubata ngwa ahia na mba US amalitego idi ire tinyekwara percent otu nari na ano bu nke omanyere mba china bu mba kachasi ebubata akulungwa na mba ahu.
Na yabu akwukwo ka anokwara huta mba iri isii ndi ozo dara iwu bu ndi nke aka ga amanyere utu nke ha malite na percent iri na otu ruo percent iri ise.
Ego utu isi ahu amanyekwuolu mba china malitere oge mba Beijing juru igakwuru Donald Trump maka iwepu utu isi nke ha manyere mba US na akulungwa nke ha.
Iga echeta na president Donald Trump mere ka amata na mbugo a ona ebugo utu isi nyere akulungwa bu iji kwalite onodu akuluba mba US kama na ndi oka mmuta doro aka na nti si na nke a nwekwara Ike ibuta agha nke onodu azum ahia.
Ulo olu n’ ahu maka ego azum ahia mba US noro una bu Tuesday nwe nzuko banyere ya kama na atumatu ha nile kuru afo n’ ala oge obi govt mba America bu white house noro kwuputa mbugo ebugoro utu isi nyere mba China.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.