Mkpocha na nzacha ndị uwe ojii mere n’ọhịa ndị e nwere na council ime obodo Owerri West nke dị na Imo State emela ka anwụchie mmadụ anọ ana enyo enyo na ha bụ ndị ntọri mmadụ.

Written by on March 5, 2025

Dịka akụkọ banyere akaọrụ nke ndị ntọri malitere mụbanyewa kwa ụbọchị n’ọhịa ndị enwegasiri n’obodo Irete yana obodo ndị gbara ya okirikiri nke council ime obodo Owerri West dina Imo State, ndị uwe ojii na state ahụ emela mkpocha na nzacha nke mere ka ha nwụchie mmadụ anọ ana enyo enyo n’aka ha dị na ọba ekere ede nke ntọri mmadụ.

Mnwuchi ahụ dịka ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na state ahụ bụ DSP Henry Okoye sịrị kọwaa, bụ otu n’ime mbọ ndị uwe ojii n’agba iji kpochapụ ihe ọbụla yiri agwa ikomiko yana mpụ na arụ ndị ọzọ na-aga n’ihu na state ahụ bụ nke na e wetara ụmụ afọ ha ụra aga n’anya.

DSP Okoye nyere aha ndị ahụ ha nwụchiri dịka Sulieman Ahmed dị afọ iri abụọ na isii, Mohammed Salisu dị afọ iri atọ n’otu, yana Gambo Jefta dị afọ iri abụọ na isii bucha ụmụ afọ Jigawa State nke mgbago ugwu ala anyị ebe onye nke anọ bụ Gabriel Ogbuzuru sitere Ebonyi State.

Ihe ndị ahụtara n’ebe nzuzo ha ahụ dị na Irete gụnyere egbe atọ ha jiri aka ha were rụọ, mma obejiri, yana akpa mbọ egbe isii nke mgbọ jupụtara n’ime ya.

Ha bụ ndị uwe ojii nke Imo State Police Command nke onye nọ n’isi ya bụ cp Aboki Danjuma mechara nyefee ọhaneze akara ekwe ntị ha ga-eji na akpọturu ndị uwe ojii n’oge ọbụla ha nwetara onwe ha na ọnọdụ gbata gbata ma ọ bụ hụ onye na-aga ije agwọ n’ime ọhịa. Ya bụ akara ekwe ntị bụ 0803 477 3600 ma ọ bụ 0814 802 4755.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited