Anọrọla taa bụ Wednesday gbochie Gov Siminalayi Fubara na-achị Rivers State ịbanye n’ogige Rivers State House of Assembly.
Written by Onyinye on March 13, 2025
Anọrọla taa bụ Wednesday gbochie Gov Siminalayi Fubara na-achị Rivers State ịbanye n’ogige Rivers State House of Assembly dina mpaghara Aba Road Portharcourt bụ ebe e kwuru na ndị omebe iwu na-akwado Nyesom Wike nọ na-enwe ọgbakọ ha.
Gov Fubara ka e kwuru na o wuchiri n’ogige ahụ yana ụfọdụ ndị ọkwá ha gbagotere na gọọmenti nke gụnyere odeakwụkwọ nyere gọọmenti state ahụ bụ Dr Tammy Danagogo tinye onye ji ọkwa Chief of staff bụ Edison Ehie bucha ndị e kwuru na ha wuchiri hụ ka ejiri nnukwu igodo kpọchie ọnụ ụzọ esi abanye n’ogige ahụ.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka Gov Siminalayi Fubara boro ebubo sina Rt Hon Martins Amaewhule kpachara chọọ ka ya ghara ịbata n’ogige ahụ kworo maka na ya kpọrọ ya oku ekwe ọtụtụ ugboro mana ọ jụrụ ịza ya oku.
Aka na-achị state ahụ mechara kwaa arịrị sina ọ bụ maka ọdịmma nke ụmụ afọ Rivers State ka ya jiri ime ihe niile ya na-eme mana ya ga-aga n’ihu na ọrụ ya dịka o siri dị n’usoro iwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.