Ochichi etiti enyela nkwado irunye ogige nsichaputa mmanu modular refinery na Abia state.

Written by on March 15, 2025

Ochichi etiti enyela nkwado irunye ogige nsichaputa mmanu modular refinery na Abia state.

Obu aka n’ achi Abia state bu governor Alex Otti mere ka ozi oma puta ihe n’ oge ona amalite olu okporo uzo ahu di 11.1 kilometers ma buru nke jikoro obehie-Umudobia nakwa Owaza nke di n’ okpuru ochichi ukwa west LGA na state ahu ma n’ akowakwa na aga arunye yabu modular refinery n’ ime ogige Abia industrial and innovative park ALLP di na mpaghara ahu.

Governor Otti mekwara ka amata,na modular refinery a ga akwalite onodu akuluba nakwa mmepe n’ ebe odi ukwu ma kpachitekwa otutu ihe ndi ahu ochichi gara aga mefuchara.

Omekwara ka amata na oge ahu eleghara ndi mpaghara ukwa anya agala, na ogaghi abuzi ebe echefuru echefu kwere maka ihe okowara si, na okporo uzo a ana aru ga enye aka n’ ikwalite azum ahia nakwa ichawaputa ogige Abia industrial and innovative park ALLP.

Governor Otti mekwara ka amata na irucha okporo uzo a n’ ime onwa iri na abuo dika aturu anya ya agaghikwa enwe isi ma oburu na ndi mpaghara ahu ju inye nkwado ha gara ndi ji yabu olu ngo.

Na nzaghachi ya nyere aririo ndi ukwa west rioro ya ,ka governor Otti noro kwe nkwa si na aga agbapekwa olu okporo uzo nke umuzike- Obokwe- Ngwaiyiekwe road n’ oge n’ adighi anya, kwere maka na enyego nkwado ya na atumatu ego mkpata na mmefu nke afo a bu 2025.

Ogakwara n’ iru kwe ha nkwa ezi mmiri onunu yanakwa idozighari oku electric na ala Asa tupu onwa March afo a anyi no n’ ime ya abia na njedebe , dika onyekwara ntuziaka gara commissioner for power and public utilities bu Mazi okechukwu Monday ka oga na mpaghara ahu ma choputa ihe ndi kwesiri ekwesi iji hu na eweghachitere oku electric na mpaghara ahu.

N’ ozi ekene ha, ka onye jiburu okwa federal legislator n’ oge enwere imo state ochie bu Dame Victoria Akanwa, nakwa nwa amadi ahu jiburu okwa SSG bu pastor Ralph Egbu nakwa otutu ndi ozo noro too governor Alex Otti maka ezi olu oma ya na mpaghara nile nke Abia state ma n’ ariokwa ka ogba mbo hu na eweghachitere ha oku electric,ezi mmiri onunu yanakwa otutu ihe ndi ozo eji enyere ndu aka.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited