Ulo ikpe Magistrates Court ji Bende LGA nke Abia State mere onodu enyela iwu ka akpuga HRH Eze James Ogbonna na ulo nga.

Written by on March 18, 2025

Ulo ikpe Magistrates Court ji Bende LGA nke Abia State mere onodu enyela iwu ka akpuga onye eze odinala na elekota obodo Okai Item bu HRH Eze James Ogbonna na ulo nga Nigerian Correctional Centre dina Umuahia bu isi obodo State ahu.

Yabu ulo ikpe nyekwara iwu ka akpugakwuo mmadu abuo ndi ozo ana ebo hana eze odinala a ebubo na yabu ulo nga.

Habu mmadu abuo ndi ozo gunyere: Mazi Igwe Anyim nakwa Ndukwe Sunday Igara.

Ndi a ka ana ebo ebubo na aka ha dina oba ekere ede nyere etu ndi ntorobia iwe dina obi siri napu nwokorobia gbara afo iri abuo enyere aha ya dika Ndukwe Isaac ndu ya na ike.

Mazi Ndukwe Isaac ka akowara na obu na abali iri abuo na asato nke onwa January afo a bu 2025 ka habu ndi ntorobia napuru ya ndu ya na ike.

Ka osiladi, na oge akpuputara ha ulo ikpe na ngwucha izu uka gara aga ka okaikpe noro na isi ikpe a bu Magistrate Elizabeth nyere iwu ka akpuga yabu onye eze odinala nakwa mmadu abuo ndi ozo ahu ulo nga.

Okaikpe a mechara yigharie ikpe ya ka oburu na abali iri abuo na asaa nke onwa a bu March.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited