Ndi omebe iwu Rivers State House of Assembly amalitela atumatu ichitu aka na achi State ahu nakwa osote ya na okwa ochichi ha.

Written by on March 18, 2025

Ulo nzuko omebe iwu Rivers State House of Assembly amalitela atumatu ana ahuta dika nke ha jiri acho ichitu aka na achi State ahu bu Gov Siminalayi Fubara nakwa osote ya bu Odoziaku Ngozi Odu na okwa ochichi ha.

Nke a putara ihe unya bu Monday na Port Harcourt bu isi obodo State ahu dika ndi omebe iwu yabu ulo nzuko nke Rt Hon Martin Chike Amaewule nona isi ha na okwa Speaker boro Gov Fubara nakwa osote ya bu Odoziaku Ngozi Odu ebubo akparama agwa ojo megidere usoro ochichi dika osiri di na iwu ala anyi.

Ndi omebe iwu a na akwado nwa amadi ahu jitopuru okwa Governor Rivers State ma noro ugbu a na okwa FCT minister bu Ezenwo Nyesom Wike gara na iru degara Gov Fubara nakwa Odoziaku Odu ozi banyere yabu ebubo akparama agwa ojo.

Na yabu ozi ka ulo nzuko ahu mere ka amata na obu alaka section 188 nke iwu ala anyi emeputara na afo 1999 dika esiri kpatugharia ya aka nakwa iwu ndi ozo ka ha gbasoro zigara Gov Fubara nakwa osote ya ozi yabu ebubo.

Iga echetazi na nghotahe no kemgbe afo 2023 tasuo na etiti Gov Fubara nakwa Ezenwo Nyesom Wike ebutela ajo onodu ngwere na agwo na etiti ndi omebe iwu Rivers State House of Assembly nakwa Gov Fubara.

Ndi omebe iwu a nokwara kemgbe acho uzo ha ga esi chituo aka na achi State ahu na okwa ochichi ya, mana atumatu ha bawanyere kemgbe izu uka onemone gara aga ulo ikpe ekpecha ogwu ala anyi bu Supreme Court of Nigeria kabichara ikpe ma kwuputa ha dika naani ndi iwu kwadoro na ulo nzuko omebe iwu Rivers State House of Assembly.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited