Otutu ndi ihe banyere otu egwuregwu Galatasaray na-amasi esila na mba Turkey fepu gawa na mba Rwanda ije kwado Victor Osimhen.
Written by Onyinye on March 21, 2025
Ọtụtụ ndị ihe banyere otu egwuregwu Galatasaray na-amasị esila na mba Turkey fepu gawa na mba Rwanda ije kwado Victor Osimhen.
Osimhen ka a na atụ anya ị sonyere ogbo ya ndị ọzọ n’otu super eagles gaa zute otu egwuregwu Amavubi nke mba Rwanda taa bụ Fraịdee na asọmpi eji etozu oke ndị ga-eso zọo iko mba ụwa nke afọ 2026.
Nwa amadi ahụ gbara afọ iri abụọ na isii ka e kwuru na o nyebeghi ma otu mkpụrụ goolu n’oge asọmpi a eji etozu oke.
Victor Osimhen abụrụla ọka omee n’otu Galatasaray bụ ebe ọ nọgoro nyee ọkpụ goolu iri abụọ na isii ma nyee aka na nke ruru ọkpụ goolu iri atọ.
Na Asọmpi ahụ ga-adị n’etiti otu Super Eagles ala anyị yana Amavubi nke mba Rwanda ga asara ọkụ ma ọ kụọ elekere ise nke mgbede taa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.