Ụlọikpe ekpecha ọgwụ n’ala anyị bụ Supreme Court of Nigeria akachapuola nkabi ikpe nke ụlọ ikpe court of Appeal jiri chụọ Sen Samuel Anyanwụ.

Written by on March 21, 2025

Ụlọikpe ekpecha ọgwụ n’ala anyị bụ Supreme Court of Nigeria akachapuola nkabi ikpe nke ụlọ ikpe court of Appeal jiri chụọ Sen Samuel Anyanwụ dịka onye odeakwụkwọ izugbe nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ikpe ahụ nke ndị ọka ikpe mmadụ ise nọrọ n’isi ya taa bụ Fraịdee kabiri ikpe ha were sị na onye ọ bụ ya kwesịrị ịbụ onye odeakwụkwọ nke ya bụ otu party bụ naanị otu PDP nwere ikikere ịkwụ nke ahụ.

Justice Jamilu Tukur bụ onye nọ n’isi ikpe ahụ buru ụzọ kachapụ nkabi ikpe nke bụrụ ụzọ bịa n’ọnwa October nke afọ 2024 bụ ebe e buru ụzọ chụọ nwa amadi ahụ n’ọrụ ya dịka odeakwụkwọ ma mecha kachapụkwa nkabi ikpe nke court of Appeal bụ ndị nọrọ n’oge nke ha kwado ịchụ n’ọrụ ahụ.

Supreme Court kwuru na onye ọ bụ ya gbara akwụkwọ ahụ bụ Aniagu Emmanuel enweghị ikikere ime nke ahụ tinyere na o nweghị ka o siri gosipụta na ọkwa nke Senator Samuel Anyanwụ dịka onye national secretary otu PDP metụtara ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited