Ndị uweojii achuọla onye uweojii ahụ gburu otu onye ma meruo mmadụ abụọ ahụ na Cross River Stata.

Written by on April 15, 2025

Ndị uweojii na Cross Rivers State achuọla Inspector Effiong Bassey, kwere maka na ogburu otu onye ma meruo mmadụ abụọ ahụ na Calabar bu ịsị obodo State ahụ.

Nkea putara ihe taata bu Monday site n’aka ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu Irene Ugbo, o mere ka amata na akpupuru Bassey n’ụlọ ikpe ma ziga ya na Afokang Correctional Centre ọdị ugbua.

O mere ka amata na ha megara ezinụlọ ahụ ogburu onye nke ha njim nkpọturu ma ga leta mmadụ abụọ ahụ omeruru ahụ na Calabar Teaching Hospital bu ebe ha nọ na anata ọgwụgwọ.

Irene Ugbo gara n’iru mee ka amata na ha na enyere ndị ahụ ihe ọdachi a metụtara aka tinyekwara ezinụlọ onye nke nwuru anwu, na ha ga agba mbọ hụ na ndi nke ahụ nwetara ihe mmerụ ahụ nwetara onwe ha, dika ọ kọwara na emela onye nke ahụ agba egbe n’onu operation, dika ọ na enweta onwe ya k’ọdi ugbua, ma kwe nkwa ime ka ohaneze mata ka ọnọdụ ahụ ike ha siri dị.

Ọ gara n’iru kọwaa na ozi ahụ n’efeghari bu nke kwuru na ha gbakutara ndị ahụ nwetara ihe mmerụ ahụ azụ bu okwu asi, ma rịọ ndị nta akụkọ ka ha gba mbọ nyocha akụkọ ha nwetara tupu ha agbasawa ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited