Mba North Korea ekwetala na ha zigara ndị agha ha ka ha gaa donyere mba Russia ukwu na agha dina etiti hana mba Ukraine.
Written by Onyinye on April 28, 2025
Ozi sitere na mba North Korea na eme ka amata na ọ bụ eziokwu na ọchịchị mba ahụ zigara ndị agha na mba Russia ịga donyere ndị agha ukwu imeri mba Ukraine site na ntụziaka onyeisi ala mba North Korea bu President Kim Jun Un.
Nkea na-abịa ka o mechara abalị ole na ole onye ji ọkwa Chief of staff na mba Russia bụ Valery Gerasimov tochara mba North Korea were kwuo na ndị agha ha bụ dike n’agha bụ nke mbụ ọchịchị obodo Moscow na ekwupụta ụdiri ihe ahụ.
Ya bụ bụ onye Chief of staff kwukwara na ndị agha ahụ nyere ha aka ị weghara ubara ala mana mba Ukraine kọwara nke ahụ dịka okwu ụgha.
Anọrọla kemgbe na ebo ebubo na ọ bụ ndị agha sitere na mba North Korea na enyere mba Russia aka n’agha ahụ na-ada n’etiti hana Ukraine. Mana ugbua, Russia ekwuola na nke ahụ bụ eziokwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.