Ndị uweojii na Edo State anwuchiela otu nwoke kwere maka ebubo na aka ya dị na ntọri atọrọ ma gbuo otu nwoke dị afọ iri ise na atọ.

Written by on June 18, 2025

Ndị uweojii na Edo State anwuchiela otu nwoke gbara afọ iri atọ na atọ kwere maka ebubo na aka ya dị na ntọri atọrọ ma gbuo otu nwoke dị afọ iri ise na atọ enyere aha ya dika Henry Ohiengbonmwan.

Onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu CSP Moses Yamu mere ka nkea puta ihe taata bu Tuesday na Benin bu isi obodo State ahụ.

Yamu kọwara na nwoke ahụ nwụrụ anwụ bu onye atọrọ na abalị iri na atọ n’ọnwa May, ọ gara mere ka amata na ozi ahụ bu nke pụtara ihe dika ogachara abalị anọ ofuru site n’ebe ọ na arụ ọrụ n’ugbo ya dị na Igueze community na Ovia North East LGA na State ahụ.

Na abalị iri na isii, ndị ọrụ Anti Kidnapping Unit ji nyocha ogbara ọhụrụ ha mata ebe onye ntọri ahụ nọ ma nwuchikọ ya, dika ọ kọwara na nwa amadi ahụ tọrọ nwoke ahụ nwụrụ anwụ bu onye Oron Community dị na Akwa Ibom State.

Yamu kọwara na oge ha na agba ya ajụjụ ọnụ na o mere nkwuputa na ọbu ya nakwa mmadụ anọ ndị ọzọ nwoke ahụ kpọrọ ọrụ n’ugbo ya kwekọritara itọrọ nwoke ahụ, gbuo ya ma lie ya n’ugbo ahụ.

O kwere ezinụlọ nwoke ahụ nwụrụ anwụ nakwa ndị bi na mpaghara ahụ nkwa na nyocha na aga n’iru iji nwuchikọ ndị nke ọzọ aka ha dị n’ọnwụ nwoke ahụ bu ndị nke nọ n’ọsọ ka ọdị ugbua.

Ọ gara n’iru mee ka amata na Commissioner ndị uweojii na State ahụ bu CP Monday Agbonika, rịọrọ ndị nwere ụlọ ahịa nakwa ndị ọrụ ugbo ka ha gba mbọ na eme nyocha nke ọma tupu ha ewe mmadụ n’ọrụ iji gbochie ụdịrị ọdachi a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Subscribe

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited