Onye ndu otu ekperime ama ama na mba Ecuador dị na South America a bụrụla onye anwụchiri ma nyefe ya n’aka mba United States.

Written by on July 21, 2025

Onye ndu otu ekperime ama ama na mba Ecuador dị na South America enyere aha ya dika Adolfo Macias Villamar, a bụrụla onye anwụchiri ma nyefe ya na aka mba United States iji nye ya ntaramahụhụ ruru ya kwere maka ịgba mgbere ọgwụ ike nakwa ngwa agha.

Nwa amadi a amakariri dịka Fito bu onye anwụchiri n’ọnwa June, dika ọfọrọ obere ihe ka ọ bụrụ otu afọ ọ gbapuru site n’ime ụlọ nga bu ebe atụrụ ya nga afọ iri atọ na anọ kwere ọtụtụ agwa ọjọ ya.

Ozi kọwara na aga akpụkpụ ya n’ụlọ ikpe US Federal court taata bu Monday, bu ebe aga ekpe ya ikpe kwere maka igba mgbere ọgwụ ike nakwa ngwa agha.

Nwa amadi a bu onye akọwara na ya na ndi otu ya so n’ime otu ndị omekome n’akpa ike ọjọ na mba Mexico nakwa Balkans, ọ bukwa onye ana enyo enyo na aka ya dị na ogbugbu egburu nwa amadi ahụ zọrọ ọkwa onye isi ala mba ahụ n’afọ 2023 bu Fernando Villavicencio.

Macias bu onye anwụchiri na Manta, dika akpụgara ya na La Roca bu ụlọ nga nwere ezi nchekwa zuru oke, ebe ndị nchịkwa ụlọ nga ahụ mere ka amata na akpụpụrụ ya ụnya bu Sunday ma nyefe ya n’aka mba US.

Onye isi ala mba Ecuador bu President Daniel Noboa toro ndị ọrụ nchekwa ahụ n’ebe ọdị ukwu etu ha siri nwuchikọ nwa amadi ahụ, dika ọ nwụrụ iyi ikpochapụ ndị omekome na mba ahụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited