Ndi Uwe Ojii Akowala Ya Dika Akuko Awarawa Bu Ozi Nkusu Na Ulo Akwukwo Dina State A

Written by on June 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State akowala ya dika akuko awarawa bu ozi ana ebughari na owa ozi mmekorita ohaneze sina ndi ochu efi bucha egbe noro na ubochi Tuesday wakpo ma toro umuakwukwo na ulo akwukwo dina Ezeagu LGA nke State a.

Na ozi onyefere ndi nta akuko na uhuruchi taata na ogige Police Command’s Headquarters dina isi obodo Enugu ka onye mmekorita ohaneze nyere habu ndi uwe ojii na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na obu ndi ekperima choro itinye ndi mmadu ujo na aru ma weta mgbagoju anya nyere ohaneze okachasi umuakwukwo, ndi nkuzi, ndi nchikwa ha nakwa ndi nne na nna bu ndi na ebughari yabu ozi awarawa okowara na ojuputara na asi.

SP Ndukwe gwara ndi nta akuko na nnyocha nakwa njem nleta ndi uwe ojii banyere yabu ozi ana ebughari gosiri na onweghi ebe obuna awakporo na Ezeagu nakwa mpaghara niile dina State a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited