INEC Eweputala Na Ozuzu Oke Aha Ndi Na Azo Okwa Senator Na Ntule Aka Ochichi By-election Ga Ewere Onodu Na Enugu State
Written by admin on June 18, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC eweputala na ozuzu oke aha mmadụ asaa nakwa otu ndorondoro ha ga eji zoo okwa Senator na ntule aka ochichi ndaputa bu by-election ga ewere onodu na ogbonta vote Enugu North Senatorial District nwanne echi bu Saturday, abali iri abuo nke onwa a bu June afo 2026.
Nke a putara ihe na ozuzu oke ya unya bu Wednesday, ebe INEC weputara aha Emmanuel Chika Idoko dika onye ga eji okoloto otu ndorondoro African Democratic Congress ADC zoo yabu okwa, ebe Israel Ikeje Asogwa ga eji okoloto All Progressives Congress APC zoo otu okwa ahu.
Ndi ozo gunyere: Kingsley Chukwuebuka Aneke nke otu ndorondoro Boot Party, Simon Ejike Eze nke Labour Party, Elias Okwudili Ossai ga azo na okoloto Nigeria Democratic Congress NDC, ebe Nestor Chika Ezeme ga eji okoloto otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP zoo nakwa Charles Ugochukwu Ugwuanyi nke People’s Redemption Party PRP.
Iga echeta na yabu ntule aka ochichi ga ewere onodu nwanne echi na abia iji roputa onye gaa anochi yabu ogbonta vote ma elegara anya na onye na anochibu ya site na okoloto otu ndorondoro Labour Party bu Sen Okey Ezea noro na onwa November afo 2025 gara aga rapu elu uwa a gawa iza oku chi kporo ya na bee ndi mmuo.
Onye nta akuko anyi wetaziri ozi na ogbonta vote Enugu North Senatorial District mejuputara na okpuru ochichi ime obodo isii ndi gunyere: Igbo-Eze North, Igbo-Eze South, Igbo-Etiti, Nsukka, Udenu nakwa Uzo-Uwani LGAs.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.