Ochichi Etiti Nigeria Akpokuola Nke Mba Cote D’Ivoire Inye Nkowa Maka Onwu Nwa Afo Ala Anyi Na Ulo Nga Abidjan
Written by admin on July 4, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt etiti ala anyi dina aka ochichi President Bola Ahmed Tinubu akpola oku nkowa doro aru site na aka ndi ochichi mba Cote D’Ivoire banyere onwu nwa afo Nigeria enyere aha ya dika Usama Murtala bukwanu onye nwuru na ebe ejichiri ya ogologo oge na ulo nga mba ahu.
Nke a putara ihe site na onu minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb. Bianca Odumegwu-Ojukwu oge okpokuru onye nnochite anya yabu mba Cote D’Ivoire na ala anyi bu Amb. Kalilou Traore na nzuko, unya bu Friday na ulo olu ya dina Abuja ma buru ebe onoro kpo oku iti aka na obi gaara ezinulo nwa afo ala anyi a nwuru na ike.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi yabu unya ka onye enyemaka puru iche nyere yabu minister na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr. Magnus Eze mere ka amata na Usama Murtala sona ime mmadụ ise ndi ozo bu umu afo ala anyi sitere Sokoto State gaa njem azum ahia na Cote D’Ivoire na onwa August afo 2025 gara aga ma buru ndi ejichiri na ulo nga dina Abidjan bu isi obodo mba ahu na enweghi ka esiri kpe ha ikpe.
Ka osiladi, Amb. Odumegwu-Ojukwu noziri na nzuko a gwa yabu onye Ivorian Ambassador nyere ala anyi ka mba ya kwughachi umu afo ala anyi ahu ihe ha niile anapuru ha oge ahu ejichiri ha, ma doo aka na nti megide udi ihe a ime ozo.
Na nzaghachi ya ka yabu onye nnochite anya mba Cote D’Ivoire bu Amb. Traore buru ozi nkasi obi gaara ezinulo nwa afo ala anyi ahu nwuru anwu nakwa ohaneze ndi Nigeria, ma kwe nkwa izigara isi obodo mba ya ozi ngwangwa maka nnyocha banyere odachi a.
Dr. Magnus Eze sitere na ozi a kowa na obu na ubochi Tuesday gara aga ka umu afo ala anyi mmadu ise nke ahu anaputara na ndu site na ezi olu ochichi ala anyi sitere Abidjan wuchie odu ugboelu Nnamdi Azikiwe International Airport dina Abuja, ebe Amb. Odumegwu-Ojukwu nakwa ndi ozo noro nabata ha.
