A tọrọla ndị njem okporo ụzọ ruru mmadụ iri na itoolu site n’aka ndị ana atụ anya na ha bụ ndị na-achị ehi na Benue state n’isi ụtụtụ ụnyaahụ bụ Thursday.
Written by Onyinye on April 25, 2025
Opekatampe ihe ruru mmadụ iri na itoolu nọ n’ime ụgbọala abụọ abụrụla ndị a tọrọ n’isi ụtụtụ ụnyaahụ bụ Thursday site n’aka ndị ana atụ anya na ha bụ ndị na-achị ehi ji ngwa ọgụ n’obodo Jor community na mpaghara okporo ụzọ si Adoka gaa Naka nke council ime obodo Gwer West dina Benue state.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ụgbọala abụọ ahụ ka anọrọ n’akụkụ okporo ụzọ chebiri n’ihe ruru ntụ kilometres atọ ma esi n’obodo Naka bụ isi ọchịchị council ime obodo Gwer West nke State ahụ.
Otu n’ime ụgbọala ahụ ka e kwuru na o si Ankpa nke dina Kogi State aga Makurdi bụ isi obodo Benue state ebe nke abụọ si Lokoja agakwa n’otu Makurdi ahụ.
Otu onyeisi eze ọdịnala na council ime obodo ahụ bụ His Royal Highness Daniel Abomtse bụ ya gwara ndị nta akụkọ maka nkusu ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.