Aka chiburu Rivers State bu Nyesom Wike ekwuola sina o gaghi abu ihe aru na achituru aka na-achi Rivers State ugbua bu Gov Siminalayi Fubara nokwa oru ya.

Written by on March 13, 2025

Aka chiburu Rivers State n’oge gara aga ma bụrụ onye nọ ka ọ dị ugbu a dịka minister n’ahụ isi ọchịchị ala anyị bụ FCT bụ Nyesom Wike ekwuola ya sina ọ gaghị abụ ihe arụ na achituru aka na-achị Rivers State ugbua bụ Gov Siminalayi Fubara nọkwa ọrụ ya.

N’okwu ya taa bụ Wednesday n’oge yana ndị nta akụkọ nwere mkparịta ụka ka Wike kwuru na e kwesịrị ichitu Gov Fubara nọkwa ya dịka aka na-achị state ma ọ bụrụ na achọpụta na o nwere iwu ọbụla ọ dara.

Onye minista ahụ gbaruru ihu etu ihe si aga ugbua na state Rivers ma kwuo mkpa ọ dị na ndị mmadụ gara n’ihu na erube isi na iwu nọkwa ọ bụla e nyere ha.

Nkea na-abịa ozugbo ọnụ na e kwuru ụlọ omebe iwu Rivers State House of Assembly bụ Martins Amaewhule nye chara Gov Siminalayi naanị mkpụrụ abalị abụọ ka ọ bịa chegharịa akwụkwọ ego mkpata na mmefu akpọrọ budget nke afọ 2025 azụ n’ihu ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited