Aka ndi uwe oji ala anyi na Gombe State akpatala otu nwokorobia gbara afo iri abuo na ise maka ebubo na omara otu obere nwata nwaanyi di naani afo isii elu na ike.

Written by on April 14, 2025

Aka ndi uwe oji ala anyi na Gombe State akpatala otu nwokorobia gbara afo iri abuo na ise maka ebubo na omara otu obere nwata nwaanyi di naani afo isii elu na ike na isi obodo Billiri LGA nke State ahu.

Nke a putara ihe na ogige Police Command Headquarters dina isi obodo Gombe State site na ozi onyefere ndi nta akuko nwanne unya bu Saturday bu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na State ahu bu DSP Buhari Abdullahi.

DSP Abdullahi kowara na obu oge obere nwa ahu na arahu ura na nke nne ya ochie ka yabu nwokorobia obi tara mmiri nwudoro ya ma maa ya elu na ike.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Gombe State kowara na obu na abali iteolu nke onwa a bu April ka nwokorobia a onyere aha ya dika Haske Abubakar kpara agwa nwankita a na ihe dika elekere ato nke ehihe ubochi ahu.

Yabu onye PPRO ndi uwe oji ala anyi na Gombe State koro ndi nta akuko na aka ndi uwe oji kpatara umunwoke ato ozo ana enyoenyo na State ahu maka ima obere umuagbobia ato nona agbata afo iri na abuo nakwa iri na asaa elu na ike.

Habu umunwoke ato aka kpatara maka agwa nwankita nke a gunyere: Dauda Babawuro, Ibrahim Safiyanu nakwa John Doctor.

Nwa amadi a kwuputara na aka ndi uwe oji kpatara otu nwoke ozo bu onye olu ugbo gbara afo iri ato na isii ebe oji aghugho kpoga otu nwokorobia gbara afo iri na asato na ime ulo ya ma kwaso ya iko na ike na udi aruru ala mmeko nwoke na nwoke amara dika Homosexuality.

Na ikpeazu ka DSP Buhari Abdullahi meziri ka amata na aga akpuga ndi a ulo ikpe ma emecha ha nnyocha ka habu eze ka udele gwa iwu ala anyi mmuo chiri ha ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Subscribe

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited