News

Page: 6

Govt Enugu State enyela ndumodu gaara ohaneze ndi State a ka ha gharakwa ige nti na ozi awarawa na agaghari sina ana ewe ndi mmadu na olu oyibo ohuru State a. Na odi nso a ka ozi malitere ifesasi na ufodu owa ozi social media na akowa na govt Enugu State na ewe ndi olu […]

Aka na achi Rivers State bu Gov Siminalayi Fubara enyela ndumodu gaara ndi okwe ndorondoro ka ha kwusi oke ochicho nke onwe ma bagidezie na ihe ndi ahu ga akwalite mmepe nakwa odimma ohaneze. Aka na achi Rivers State nyere ndumodu a unya bu Tuesday na mmeme mgbape okporo uzo Okocha road dina mpaghara Rumu […]

Ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti ala anyi akwadola ya gafere nguputa nke ugboro abuo bu atumatu iwu maka nruputakwuo otutu ogige aruike ndi okacha mara banyere oya anya akporo Specialist Eye Care Centres na mpaghara di ichiche nke Nigeria. Yabu atumatu iwu na acho maka mkpatughari aka na iwu National Eye Care Centre Act […]

Etola aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah na ebe odi ukwuu maka mbo ona agba nyere ngalaba mmuta State a okachasi dika osiri metuta olu ngo ulo akwukwo Smart Green Schools omalitere na onumara Wards di nari abuo na iri isii na State a. Otito a putara ihe unya bu Tuesday […]

Opekata mpe mmadu isii ezutela onwu mberede ha na ihe mberede okporo uzo mere ohuru ozo na ogologo okporo uzo Awuyo/Adiyani Expressway dina Guri LGA nke Jigawa State. Yabu odachi ka ozi kowara na obu na abali putara taata bu Wednesday ka owere onodu dika ogasiri naani abali abuo ihe mberede okporo uzo ozo mere […]

Ulo olu nnochite anya mba United States of America akporo US Embassy enyela ntuzi aka ohuru gaara umu afo Nigeria na acho ohere Visa isite ala anyi a gawa mba America na usoro ha ga agbasoro. Nke a bu dika osiri metuta ndi ahu nnwale ha maka yabu ohere Visa ga ewere onodu ma ogasia […]

Ulo olu ministry ogogo etiti ala anyi na ahu maka olu nakwa ulo olu nke ahu na ahu maka ngote akuru ngwa eji aru olu ohaneze amara dika Bureau of Public Procurement BPP amalitela amuma iji buo agha megide ihe mgbochi ndi ahu na adi na eme ka olu ngo na akpu na afo na […]

Ayiola ndi okpu ugboala ka ha gbado anya nke oma na ihe banyere nleta ezi onodu ugboala ha tupu ha ebuputa ha na okporo uzo, iji zeere ihe mberede okporo uzo ana adi na ahutakari okachasi na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso. Ayiyo a putara ihe na ngwucha izu uka […]

Nwa amadi ahu jigodu okwa ochi agha izugbe ndi agha elu ala Nigerian Army na okwa Acting Chief of Army Staff bu Lt Gen Olufemi Oluyede anorola taata bu Monday malite olu dika ochi agha izugbe ndi agha ala anyi a na ozuzu oke ya na udi nke akporo Substantive Chief of Army Staff. Malite […]

Otu jikoro ndi olu ngalaba ikpe ala anyi akporo Judiciary Staff Association of Nigeria JUSUN ngalaba ya nke Benue State agala kpochie onu uzo ama ogige ulo ikpe Benue State High Court dina Makurdi kwere maka ekweghi akwu ha ugwo opekata mpe ohuru di puku Naira iri asaa na ise. Nke a bu dika habu […]


Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies