Commissioner ndị uwe ojii na Anambra Steeti yana ndị ọkwọ ụgbọala opi ike bụ truck enwela ọgbakọ maka etu aga esi belata ihe mberede okporo ụzọ na state ahụ.

Written by on March 20, 2025

Commissioner ndị uwe ojii na Anambra Steeti bụ CP Ikioye Orutugu anọrọ taa bụ Wednesday nwee ọgbakọ hana ndị ọkwọ ụgbọala opi ike bụ truck kworo maka ihe mberede okporo ụzọ a malitere inwe aghara aghara na state ahụ.

Onye Commissioner ahụ nọrọ n’oge ọgbakọ ahụ gwa ndị ọkwọ ụgbọala ahụ na malite ugbua gawazie n’ihu na ndị uwe ojii hana ndị njem ije awele bụ federal road safety Corp gana aruko ọrụ ọnụ ịhụ na iwu na-achịkwa njem okporo ụzọ bụ nke e tinyere n’ọrụ.

Ọgbakọ ahụ ka ehiwere kworo maka otu ihe mberede okporo ụzọ nke tara isi mmadụ isii na mpaghara Onitsha na ngwụcha izu ụka anyị pụrụ n’ime ya.

Nkea pụta ihe site n’otu akwụkwọ ozi nke ndị uwe ojii mere ka o ruo ọhaneze aka site n’ọnụ onye na e kwuru ndị uwe ojii na state ahụ SP Ikenga Tochukwu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited