Gọọmenti Anambra Steeti emela ka amata ihe kpatara ha jiri machie izi ozi ọma aghara aghara na state ahụ.
Written by Onyinye on March 12, 2025
Gọọmenti Anambra Steeti ekwuola sina mmachi ahụ ha machiri izi ozi ọma n’okporo ụzọ yana ahịa abụghị ka ha kwụsị ozi ọma Alaeze eluigwe kama na ọ bụ iji gbochie mkpọtụ na esi na ya apụta.
Commissioner n’ahụ maka nzirikota ozi na Anambra Steeti bụ Dr Law Mefor kwuru nkea n’ozi o nyefere ndị nta akụkọ taa bụ Tuesday na Awka bụ isi obodo Anambra Steeti.
Onye Commissioner ahụ kwuru na mkpọtụ nke nwa bekee kpọrọ noise pollution bụ ịda n’iwu public health law of Anambra Steeti nke atọ 2006.
Gọọmenti state ahụ rịọrọ ọhaneze yana ndị ụka ka ha ghara ịghọtahe aka na-achị Anambra Steeti bụ Gov Chukwuma Soludo kama ka ha na a chịkọba okpukperechi ha n’ime ụlọ ụka ha ma ọ bụ n’otu ogige ebe ndị mmadụ ga agbako nụrụ okwu Chukwu kama ime ya n’ụdị ga e butere ndị ọzọ okoro n’ihe ize ndụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.