Gov Siminalayi Fubara na-achị Rivers State ekwuola n’otu ihe ga a kacha megide ya bụ ịhapụ ocheeze ya mana ọ pụtaghị n’ụwa abịala n’isi njedebe n’ebe o metụtara ị gara ụmụ afọ state ahụ ozi.

Written by on March 5, 2025

Aka na-achị Rivers steeti bụ Gov Siminalayi Fubara ekwuola na ụjọ ọbụla anaghị atụ ya n’ihe ọ ga-emecha were mụpụta bụ ọgba aghara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na-ada na state ahụ ugbua.

Gov Fubara kwuru nkea ụnyaahụ bụ Monday n’oge ọ gara igbape ụlọ obibi nke a rụrụ ndị ọrụ nke gọọmenti state ahụ na Portharcourt bụ isi obodo Rivers State.

O kwuru n’otu ihe kacha njọ nwere ike ị dakwasị ya bụ ịhapụ ọkwa ọchịchị ya dịka aka na-achị state. Ọ kwara arịrị na ya amaghị ihe kpatara oge ọbụla ya zọpụru ị rụrụ ụmụ afọ state ahụ otu ihe nkea ma ọ bụ nke ọzọ, na otu ihe ga abịariri dọghachi aka elekere azụ ka ọchịchị ya malite n’isi mbido.

Onye aka na-achị state ahụ mechara too ụmụ afọ Rivers maka ịga n’ihu na adọnyere ọchịchị ya ukwu n’agbanyeghị ihe aka mgba ọ na-agabiga.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ọgba aghara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị nke ndị kwe na ndị ekwena malitere na Rivers State kemgbe afọ abụọ gara aga n’etiti ndị nkwado Gov Siminalayi Fubara yana ndị nkwado ogbo ya nyefere ya ọkwa ọchịchị ma bụrụkwa minista n’ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike.

Nkea mere ka Ụlọikpe supreme Court of Nigeria nọrọ n’ụbọchị Friday gara aga kwuo ka ọ ga-adị na Rivers State bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ hụtara nkabi ikpe dịka mmeri nyere ndị nkwado Nyesom Wike.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited