Mazi Peter Obi akwala ariri maka nkawanye njo nke ajo onodu ubiam onu ntu umu afo ala anyi na abanye na ime ya kwa ubochi.
Written by Onyinye on May 7, 2025
Nwa amadi ahu ji okoloto otu ndorondoro Labour Party zoo okwa onye isi ala Nigeria na afo 2023 bu mazi Peter Obi agala na iru na ikwa ariri megide ihe ona akowa dika nkawanye njo nke ajo onodu ubiam onu ntu umu afo ala anyi na abanye na ime ya kwa ubochi.
Mazi Peter Obi nke jiburu okwa Governor Anambra State kwuputara na ala anyi a bu Nigeria buzikwa isi obodo ubiam na mba uwa niile na udi okporo World’s Poverty Capital.
Yabu onye Labour Party Presidential Candidate nyere nkowa ndi a na agbanyeghi okwu nkwugide ufodu ndi gunyere: govt etiti, aka na achi Lagos State bu Gov Babajide Sanwo-Olu nakwa ndi ozo na ekwu ekwugide nkowa ya megide akuluba ala anyi.
Na okwu ya unya bu Tuesday oge owuchiri ulo akwukwo mahadum Godfrey Okoye University dina Enugu nakwa njem nleta gaara ogige Basic Health Centre dina Ihuokpara nke Nkanu East LGA dicha na State a ka Peter Obi kowara na mmasi ya gaara ngalaba mmuta nakwa aruike bu kwere maka ezi mkpa habu ngalaba abuo di nyere onodu obibi ndu.
Nwa amadi a kwuputara na ona aruko olu nyere uka Christ kwere maka ntunye oke ya na nkwalite ngalaba aruike nakwa nke mmuta.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na mazi Peter Obi mechara nyefe onyinye ego di nde Naira iri abuo yabu; 20 Million Naira na otu na otu gaara ulo akwukwo mahadum Godfrey Okoye University, Enugu nakwa ogige Basic Health Centre dina Ihuokpara.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.