Mmadu isii bu ndi ji okoloto otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP anochite ogbonta vote ha di ichiche nke Delta State agbaghapula yabu otu ndorondoro.

Written by on May 7, 2025

Mmadu isii bu ndi ji okoloto otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP anochite ogbonta vote ha di ichiche nke Delta State na ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives ala anyi agbaghapula yabu otu ndorondoro PDP ma banye na nke All Progressives Congress APC.

Nke a putara ihe unya bu Tuesday na ozuzu oke ya oge habu ndi omebe iwu ogogo etiti ala anyi kwuputara opupu ha na ogbako plenary yabu ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti.

Na oge ona aguputa aha ndi a gbaghapuru PDP na yabu ogbako plenary ka onye Speaker ulo nzuko ahu bu Rt Hon Tajudeen Abbas nabatara ha nke oma na otu ndorondoro APC.

Ka osiladi, na ederede ndi omebe iwu mmadu isii a sitere Delta State ka ha mere ka amata na obu ogbaghara dina otu ndorondoro PDP kpatara ha jiri gbaghapu ya ma banye na nke APC.

Habu ndi omebe iwu mmadu isii ogogo etiti ala anyi sitere Delta State gbaghapu otu ndorondoro PDP banye na nke APC gunyere: Hon Nnamdi Ezechi, Jonathan Ukodiko, Nicholas Mutu, Thomas Ereyitomi nakwa Hon Julius Pondi gunyeziere Hon Victor Nwokolo.

Iga echetazi na obu na izu uka abuo gara aga ka aka na achi yabu Delta State bu Gov Sheriff Oborevwori, onye jitopuru okwa Governor State ahu ma burukwa Vice Presidential Candidate otu ndorondoro PDP na ntule aka ochichi afo 2023 bu Sen Ifeanyi Okowa gunyere otutu ndi ozo gbaghapuru otu ndorondoro PDP ma banye na nke APC.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited