Ndi ogbonta vote Enugu North Senatorial District enyela nkwado ha gara governor Peter Mbah make iga ochichi nke ugboro abuo.

Written by on April 12, 2025

Ndi ndu ogbonta vote Enugu North Senatorial District amakariri dika ndi Nsukka Zone, ekwuputala nkwado ha gara aka n’ achi Enugu State bu Governor Peter Ndubuisi Mbah, ka oga n’ iru n’ ochichi ya ma chiri gafe afor 2027, kwere ma mgbanwe ha kowara na governor mbah gbanwere mpaghara ahu n’ihe n’ erubeghi afo abuo obanyere n’ ochichi.

Habu ndi ndu Nsukka bu ndi nke gbakotara na ogige Adada house dina Nsukka unya bu Thursday site na ngalaba Enugu State Coalition for progress, Enugu North Senatorial Zone Branch, bu ndi mejuputara na ndi oka mmuta,ndi Eze odinala ,ndi okwe ndorondoro, ndi ahia nakwa ndi olu ugbo,ma nwoke ma nwanyi sitere na council isii enwere na mpaghara ahu nuputara n’ igwe ma nye nkwado ha gara ochichi governor Peter Mbah.

Na ozi onyefere ndi nta akuko oge ha nwechara mkparita ububo nyere otu digasi iche sonyere ha nke ndi binyere ya aka ruru nari asaa n’ onu ogugu bu ndi gunyere: nwa amadi ahu jiburu okwa Deputy governor bu chief Okechukwu Itanyi, send Chuka Utazi nke otu ndorondoro APC, deputy speaker Enugu State House of Assembly bu Rt Hon Ezeani Ezenta, igwe Dr HN ukuta, Prof osita ogbu nakwa otutu ndi ozo,noro guputa otutu olu ngo governor mbah arunyegasiri na Enugu State okachasi na mpaghara Nsukka,bu nke kpatara ha ji akwadosiya Ike.

Na nkpebi ha nakwa ozi inye elele, ka otu a noro too ochichi governor mbah kemgbe obanyere n’okwa n’ ime onwa May afo 2023 ma n’ akowa na obu ya bu otu onye ndi Nsukka na akwado na ntuliaka ochichi afo 2027.

N’ oge ha na aguputa ufodu olu ngo governor Mbah arunyegasiri na Nsukka bu nke wetagoro ezi mmekpe na mpaghara ahu,ka otu a noro rutu aka n’ ulo akwukwo green smart schools di otu nari na abuo tinyekwara ebe nlekota aru Ike akporo type 2 primary healthcare centers di otu nari na abuo orunyegasiri n’ ime council isii enwere na mpaghara ahu, N’ agbanyeghi otutu olu oma ndi ozo bu agukata agba awa bu ndi nke orunyegasiri n’ ime Enugu, Ma n’ akowa na habu ndi Nsukka kachasi rite erere ochichi ya.

Ha gakwara n’ iru rutu aka n’ ime ya ka ogba nkpi abuo bu okporo uzo ahu sitere Enugu -ugwogo Nike gawa OPI Nsukka nakwa otutu olu oma ndi ozo webatagoro ezi mmekpe ma kwalitekwuo onodu akuluba na state a.

Iji gosi afo ojuju ha n’ ebe governor mbah no,ka chief ukuta noro me ka amata na obughi so na ha ga akwu governor mbah n’ azu n’ oge ntuliaka ozo kama na ha ga ariokwa ya mgbaghara maka agwa ngaghie uzo ha jiri cho itunyere onye n’ ekwesighi.

Sen utazi nke otu ndorondoro APC , Dr Ajogwu tinyekwara Hon Ezeani nokwara n’ otu aka ahu too governor mbah make ezi olu ya dika opuru iche na Enugu State ma kowa si na okwesiri ka onweta nkwado ndi Nsukka nile.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited