Ndị otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party PDP, na Sokoto State ekwuputala obi ha gbasara etu ọchịchị dị ugbua.

Written by on April 15, 2025

Ndị otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party PDP, na Sokoto State ekwuputala obi ha gbasara etu ọchịchị dị ugbua bu nke otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress APC nọ n’isi ya si eme ego ọchịchị ime obodo na State ahụ.

Nkea putara ihe n’ụbọchi Saturday site n’aka onye isi oche otu PDP bu Hon. Bello Aliyu Goronyo, n’oge ha na ndị isi otu ndọrọndọrọ ahụ sitere na State ahụ, zonal nakwa ogogo ọchịchị ime obodo bu nke were ọnọdụ na PDP secretariat na Sokoto.

N’oge ọgbakọ ahụ, Hon. Goronyo kwụsịrị ike n’ihe ọkọwara dika mkpa ọ dị igba n’anwu ma kọwa etu ọchịchị ime obodo siri eme ego enyere ha, dika ọkọwara na ụfọdụ ndị Council ime obodo na State ahụ anaghi enweta ego ruru ha bu nke na egbochi ha ịrụ ọrụ ha.

Ọ gara niru mee ka amata na oburu na elebaghi nsogbu ndia anya ma chọta ogbugbo nyere ha, na onwere ike igbochi mbo ana agba n’iweta mmepe na ime ime obodo.

Otu ndọrọndọrọ PDP gara n’iru metu aka na ihe ndi ekwesịrị ime na State ahụ nke gụnyere ịgba mbọ hụ na aruputara mmiri ọnwụnwụ na State ahụ, Goronyo kpọkuru government dị ugbua ka ọ gba mbọ na ebuwa ọ dị mma ụmụ afọ State ahụ ụzọ.

Hon. Goronyo kwupụtara nchekwube ya gbasara ntule aka ọchịchị aga eme na afọ 2027, dika ọ gara n’iru kwuo na otu ndọrọndọrọ PDP dị njikere n’iweputa ezigbo ndị ndu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited