Ọkụ ọgbụgba tasuru na ọgbakọ abalị akpọrọ nightclub na mba North Macedonia ataala isi mmadụ iri ise n’otu ma merụọ ndị kariri otu narị ahụ.
Written by Onyinye on March 17, 2025
Opekatampe mmadụ iri ise n’otu nwụnyuru anya piii ebe ndị kariri otu narị merụrụ nnukwu ahụ n’oge ọkụ ọgbụgba tasuru na ọgbakọ abalị akpọrọ nightclub n’isi ụtụtụ taa bụ ụka n’obodo Kocani nke dina mba North Macedonia.
Minista n’ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ bụ Pance Toskovski kwuru na ọ bụ otu akọrọ ngwa na ndị mmadụ ji n’oge ọgbakọ ahụ bụ nwuru ọkụ.
N’otu ihe onyonyo ka hụrụ mgbe ndị ọkụ egwu kana akụ egwu bụ oge otu ihe yiri mkpọ ọkụ knock out atụrụ n’ikuku nọrọ nwụrụ ọkụ.
Prime minister obodo ahụ bụ Hristijan Mickoski ka ahụrụ na ọwa ozi Facebook bụ ebe ọ nọrọ kọwaa nsogbu ahụ dakwasịrị obodo ya dịka nke kacha bie ha aka ọjọọ.
O kwuru na ebe ọkacha njọ bụ na ọ bụ ndị ntorobịa ka n’ọnụ ọgụgụ ndị ahụ mmiri fara na eze tinyere ndị nke merụrụ ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.