Otu European union amalitela imanyere mba US utu isi na ngwa ahia nke ha.
Written by Onyinye on March 12, 2025
Ego utu isi ngwa ahia ahu president Donald Trump manyere n’ eru akuru ngwa steel nakwa nke aluminum bu ndi nke ana ebubata na mba America amalitela idi ire.
Atumatu a bu nke ejiri bunie ego utu isi akuru ngwa ahia steal ana ebubata na mba US gbago na percent iri abuo na ise ma norokwa n’ otu aka ahu machie ngupu agupuru ufodu mba n’ ukwu yabu utu isi.
Nkea kpataziri otu European union jiri ziputa ozi nzaghachi si na oga amanyekwu ego nke ya gara mba US nke ga abu E26bn gara ngwa ahia mba US.
President Donald Trump chere na mbugo utu isi ngwa ahia a obugoro ga akwalitekwu akuru ngwa steel nakwa aluminum nke mba US kama na n’eme nnyocha n’ akowa na oga emezi ka yabu akuru ngwa gara onu gara ndi mba US ma bikwa onodu akuluba ha aka ojo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.