Otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri na asatọ atọla ụmụ nwanyị iri ime na Anambra State.
Written by Onyinye on May 9, 2025
Otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri na asatọ atọla ụmụ nwanyị iri ime na State ahụ, Commissioner na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị nakwa ọdịmma ọhaneze bu Ify Obinabo, mere ka nkea puta ihe site n’ihe onyoonyo o weputara n’ụwa ozi, dika ọ kọwara na ebutara ya okwu a n’ubochi Tuesday.
Mmadụ abụọ n’ime ndị ahụ nwatakịrị nwoke ahụ tụrụ ime bu nwa Nna ya ukwu nakwa onye na azụrụ Nna ya ukwu ahụ ahịa, ebe mmadu asatọ ndị ọzọ bu ndi ọtụrụ ime, n’ime n’ọnwa abụọ osi bee Nna ya ukwu bata bu ebe anọrọ gba ya ụgbọ nwa mkpi, n’okwu ya n’ihe onyoonyo ahụ o weputara n’ụwa ozi, Obinabo mere ka amata na ọ chọrọ enyemaka ohaneze etu ọ ga esi dozie okwu ahụ kwere maka na okwu ahụ bu nke tara akpụ nke ukwu.
Kosila di, onye commissioner ahụ emeghi ka amata obodo yabu nwatakiri nwoke sitere ya nakwa aha Nne ya n’oge ọ na enye nkọwa gbasara okwu ahụ.
Obinabo mere ka amata na okwu a karịrị ya kwere maka afọ ole nwatakịrị nwoke ahụ dị ya nakwa ọtụtụ ụmụ nwanyị ọ tụwara ime, ye mere ojiri chọọ enyemaka ohaneze iji dozie okwu ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.