Otu ohaneze ndi Igbo egosiputala obi anuri ha gara umu afo Igbo bi na mpaghara Edo State.
Written by Onyinye on April 26, 2025
Otu ohaneze ndi Igbo n’ uwa nile egosiputala obi anuri ha gara otu akporo “Akiko Uwa Social Cultural Group” dika ha merubechara emume nke akporo igbanke unity festival nke isi okwu ya bu,” Igbanke Nor be Bini” nke umu afo Igbo bina mpaghara Edo State, bu ndi nke amakariri ndi Igbanke.
N’ ozi onyefere ndi nta akuko, bu senator John Azuta-Mbata, ka president general otu ohaneze ndi Igbo, tinyekwara ndi otu ya noro too ndi Obodo Igbanke maka ezi atumatu ha nwere igosiputa njirimara ha yanakwa uchu ha di imerube mmeme n’ egosi na ha sitere n’ agburu ndi Igbo .
Yabu mmeme bu nke n’ akwalite idi n’ otu n’ akwa nchekwaba omenala bu nke akowara dika ihe iriba ama nke nchekwube na nkuzi diara Obodo ndi ozo di n’ ala Igbo.
Ohaneze ndi Igbo gakwara n’ iru kwe nkwa inye nkwado ha gara yabu otu Akiko Uwa Social Cultural Group na mmeme ndi ozo haga achikoba n’ odi n’ iru.
N’ aka nke ya, ka senator Azuta-Mbata kowara mkpa odi ndi Igbo idiko n’ otu kwere make ihe okowara si n’ obu anyuko mamiri onu, ogba ufufu . Ma tokwa ndi Obodo Igbanke maka ezi olu oma ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.