Otu ọhaneze Ndigbo ekwuola na ha ga adọnyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla chọrọ ịnye nwa afọ Igbo ọkọlọtọ ha maka ọkwa onyeisi ala nke afọ 2027

Written by on March 12, 2025

Otu jikọtara ụmụ Igbo n’ụwa niile akpọrọ ọhaneze Ndigbo emela ka o doo anya na ha ga-eme ihe niile ike kwere ha ịhụ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla wepụtara nwa afọ Igbo dịka onye ga a zọro ha ọkwa onyeisi ala ma wepụta onye mgbago ugwu dịka osote ya maka ntụliaka onyeisi ala Nigeria nke afọ 2027 bụ ndị turu ugo.

Ọhaneze kwuru na ububo ọbụla ana akpa ka ọ dị ugbu a n’udi ahụ nwa bekee kpọrọ Coalition bụ nke na ebughi n’uche na ọ bụ nwa afọ ga anọrọ n’isi ụgbọ abụrụla nke kpụrụ afọ n’ala site na mmalite.

Nkea pụtara ihe site n’akwụkwọ ozi nke otu alaka ya bụ otu nke ọ bụ Okechukwu Isiguzoro ji ọkwa ya dịka Deputy President General yana chief Chinenyeze Thompson Ọhịa binyere ya aka ha taa bụ Tuesday.

Ha kwuru nkea dịka nzaghachi nyere akụkọ ahụ ahụrụ ka nwa amadi ahụ chiburu Kaduna State bụ Násír El Rufai sitere n’otu ndọrọndọrọ APC ọ nọ bụ na ya were banye n’otu Social Democratic Party SDP.

Ọhaneze Ndigbo kwudosiri ike na onye sitere na ndịda ugwu ala anyị ga achịzuriri afọ asatọ zuru oke nke ga akụrụ ọnụ n’afọ 2031 dịka aka chigoro ala anyị n’oge gara aga bụ Muhammadu Buhari chizuru afọ asatọ nke ndị mgbago ugwu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited